Abụ Ọma 134 (BIU)
Abụ Ọma 134
Abụ nrigo.
Toonu Onyenwe anyị
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile
ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.
2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya134:2 1Tm 2:8
ma toonu Onyenwe anyị.
3Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa
site na Zayọn gọzie unu.