Abụ Ọma 75 (BIU)
Abụ Ọma 75
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke
1Anyị na-eto gị, O Chineke.
Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.
Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
2Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka.
Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
3Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji,
ọ bụ m na-ejidesi ogidi75:3 Ya bụ, ntọala ya ike ka o guzo chịm. Sela
4Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ,
nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a unu elu.
5Unu ewelila mpi unu megide eluigwe;
unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”
6Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,
maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
7Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;
ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
8Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị
nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.
Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa
na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
9Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
10bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,
ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”